JOB 9:1-20 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JOB 9:1-20 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Job zara sị: “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke? Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya? Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ? Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya. Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji. Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye. Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri. Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe. Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta. Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya. Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’ Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya. “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka? Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere. A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị. Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya. Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m. Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya. A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.
JOB 9:1-20 IGBOB (Bible Nso)
Job we za, si, N'ezie amawom na ọ di otú a: Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke? Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé, Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri. O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo? Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya, Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya. Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya, Ogidi-ya nile we ma jijiji. Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa; Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà. Onye nání Ya nēseti elu-igwe, Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu. Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida. Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi; Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi. Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya: Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya. Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu? Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme? Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi; Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya. Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya, Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya? Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya; Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara. Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam; M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum; Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru, Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù. Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu, Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile. Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya! Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e? Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe: Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.