Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 5:8-18 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JOB 5:8-18 IGBOB (Bible Nso)

Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum: Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi; Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh: Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala, Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi: Ido ndi di ala n'ebe di elu; Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa. Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ, Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere. Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa. N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali. O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha, Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike. Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya, Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya. Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile. N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u, Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.

JOB 5:8-18 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile. Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ. Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo, ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile. Ọ na-ebuli ndị dị ala elu, na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha. Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ, ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere. Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile, mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ. Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie, nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị; Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ, ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike. Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya, ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya. “Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị; ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile. Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha; Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.