Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 4:4-6 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JOB 4:4-6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ, ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji. Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba; nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji. Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị, izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?

JOB 4:4-6 IGBOB (Bible Nso)

Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike, I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume. Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi; Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji. Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi? Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?