Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 24:22-24 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JOB 24:22-24 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ. Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile. A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị, a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ, a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.

JOB 24:22-24 IGBOB (Bible Nso)

Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya: O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu. Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya; Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha. Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi; Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile, Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.