Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 24:1-25

JOB 24:1-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe? Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a? Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala, na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi. Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei, ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe. Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa. Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha. Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara, otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri, ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri. Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi, na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume. Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị, ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi. Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ, ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba. Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara. Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe. Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị, ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ. Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya, ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ. Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili, mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka. Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a. “Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè, ndị na-amaghị ụzọ ya maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya. Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi. Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji; ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ ọ na-ekpuchikwa ihu ya. Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ. Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha, ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi. “Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha. Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi. Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa, ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ. Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ. Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile. A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị, a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ, a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka. “Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”

JOB 24:1-25 Bible Nso (IGBOB)

Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e? Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile? Ufọdu nēwezuga ókè-ala; Ha anapuwo kwa ìgwè aturu n'ike, we nāzù ha. Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei, Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe. Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye: Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù. Le, dika inyinya-ibu-ọhia n'ọzara Ka ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike; Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri. N'ọhia ka ha nile n'otù n'otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi; Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n'ubi-vine onye nēmebi iwu. Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi. Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha, Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume. Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike, Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe: Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka; N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu; Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku. Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè, Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke: Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu. Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè; Ha amataghi uzọ-ya nile, Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile. Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye; N'abali kwa ọ di ka onye-ori. Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama, Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim: Ọ nēzobe iru-ya. O gwupúwo ulo n'ọchichiri: N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ; Ha amaghi ìhè. N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu; N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu. Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu; Anākọcha òkè-ha n'uwa: Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru. Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike: Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo. Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri; Agaghi-echeta kwa ya ọzọ: Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi. Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa; Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma. Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya: O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu. Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya; Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha. Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi; Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile, Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka. Ma ọ buru na ọ dighi otú a ub͕u a, ònye gēme ka amara na abum onye-ugha, Me okwum ka ọ buru ihe-efu?