JOB 23:10-12 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JOB 23:10-12 IGBOB (Bible Nso)
N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa. Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso; Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem. Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya; Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.
Kesaa
JOB 23 IGBOBJOB 23:10-12 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ maara ụzọ m na-aga, mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo, ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe. Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m; a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.
Kesaa
JOB 23 BIU