JOB 20:4-11 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JOB 20:4-11 IGBOB (Bible Nso)
Ì mawo nka site na mb͕e ochie, Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa, Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya? Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe, Isi-ya ewe metu igwe-oji; Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi: Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ? Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali. Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ; Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ. Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye, Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya. Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya, Ma o gēso ya dina n'elu ájá.
JOB 20:4-11 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa. Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge. Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii; ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’ Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu. Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ, ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ. Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya. Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.