Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 20:1-29

JOB 20:1-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị: “Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu. Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m, ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị. “Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa. Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge. Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii; ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’ Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu. Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ, ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ. Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya. Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ. “Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ, na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya; ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya, ọ na-edebe ya nʼọnụ ya, ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya, ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya. Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara; Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha. Ọ ga-amịcha elo agwọ, eze agwọ ajụala ga-egbu ya. Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi, bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu. Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ. Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla, ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị. “Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya; ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya. Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa, ọganihu ya agaghị adịgide. Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya. Mgbe o rijuru afọ ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya, iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo. Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga, àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ. Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya, site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma. Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya. Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya, ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya. Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya ụwa niile ga-ebili megide ya. Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya; oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke. Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu, ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”

JOB 20:1-29 Bible Nso (IGBOB)

Zofa, bú onye Neama, we za, si, N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim, Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem. Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere, Mọ nke nghọtam nāzakwam. Ì mawo nka site na mb͕e ochie, Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa, Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya? Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe, Isi-ya ewe metu igwe-oji; Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi: Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ? Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali. Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ; Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ. Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye, Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya. Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya, Ma o gēso ya dina n'elu ájá. Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya, Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya; Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya, Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya; Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo, Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya. O lodawo àkù, we b͕oputa ya: Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu. Nsi aju-ala ka ọ gāmiri: Ire agwọ gēb͕u ya. Ọ gaghi-ele miri-iyi anya, Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru. Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya; Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a. N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha; Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya. N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya, Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya. Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi; N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike. N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya: Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya. Ka o rue, n'iriju afọ-ya, Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya, Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya. Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga, Uta ọla gāb͕apue ya. Ọ dọputawo ya, o we si n'aru-ya puta: Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n'òlùlù-ya puta; Oké ujọ nile di n'aru ya. Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba: Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya; Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya. Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya, Ala nēbili kwa imegide ya. Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n'ala ọzọ, Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n'ubọchi iwe-Ya. Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n'aka Chineke, Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.