JOB 2:4-10 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JOB 2:4-10 IGBOB (Bible Nso)
Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya. Otú ọ di, biko, setipu aka-Gi, metu okpukpu-ya metu kwa anu-aru-ya, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi. Jehova we si Setan, Le, ọ nọ n'aka-gi; nání debe ndu-ya. Setan we si n'iru Jehova pua, were ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n'ọbu-ukwu-ya rue opu-n'isi-ya. O we were n'onwe-ya ejùjù iji kọ onwe-ya ọkọ; ya onwe-ya nānọdu kwa n'etiti ntu. Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua. Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.
JOB 2:4-10 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ekwensu zaghachiri ONYENWE ANYị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya. Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.” ONYENWE ANYị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.” Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu ONYENWE ANYị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya. Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ. Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.” Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.