JOB 2:3
JOB 2:3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.”
Kesaa
Gụọ JOB 2