Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 14:7-9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JOB 14:7-9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Ma olileanya dịịrị osisi; nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa, alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa. A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala, maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja, mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya, ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.

JOB 14:7-9 IGBOB (Bible Nso)

N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya, Na ome-ya agaghi-akwusi kwa. Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala, Ogwe-ya anwu kwa n'ájá; Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ, Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.