JOB 14:1-17
JOB 14:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Mmadụ nke nwanyị mụrụ nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu. Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga. Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị? Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha? Ọ dịghị onye ọ bụ. Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ; ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile, kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga. Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ. “Ma olileanya dịịrị osisi; nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa, alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa. A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala, maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja, mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya, ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ. Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya; ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga. Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata, maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị, otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ; tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya, agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha. “A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m. Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m, aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa. Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị, agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị. Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ, ma ị gaghị agụkọ mmehie m. A ga-ekechi njehie m nʼakpa, ị ga-ekpuchi mmehie m.
JOB 14:1-17 Bible Nso (IGBOB)
Madu nke nwayi muru, Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n'ahuhu. Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya: O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa. Ọ̀ bu kwa n'aru onye a ka I megheworo anya-Gi, Me ka m'so Gi ba n'ikpé? Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n'ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya. Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi, I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya; Lepu ya anya, ka o we kwusi, Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu. N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya, Na ome-ya agaghi-akwusi kwa. Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala, Ogwe-ya anwu kwa n'ájá; Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ, Wa kwa alaka dika ihe akuru aku. Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya: Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa? Miri esiwo n'oké osimiri la, Osimiri we tasia, takọrọ; Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa: Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta, Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ, Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri, Ma asi na I kparam ókè, we chetam! Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ? Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche, Rue mb͕e nb͕anwem gābia. I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi: Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi. N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu: Ì dighi-elezi nmehiem anya? Akachiwo njehiem akàrà n'àkpà, I we tekpue ajọ omumem ihe.