JOB 11:7-9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JOB 11:7-9 IGBOB (Bible Nso)
Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke? Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu? Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme? Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara? Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa, Di kwa obosara kari oké osimiri.
Kesaa
JOB 11 IGBOBJOB 11:7-9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke? I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile? Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma? Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa, dị obosara karịa oke osimiri.
Kesaa
JOB 11 BIU