JỌN 18:8-9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JỌN 18:8-9 IGBOB (Bible Nso)
Jisus zara, si, Agwaram unu na Mu onwem bu Ya: ya mere ọ buru na unu nāchọm, ka ndia la: ka okwu O kwuru we mezu, si, N'etiti ndi I nyeworom ọ dighi onye ọ bula M'tufuru.
Kesaa
JỌN 18 IGBOBJỌN 18:8-9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara, “Agwara m unu na Ọ bụ m. Ọ bụrụ na unu na-achọ m, hapụnụ ndị a ka ha laa.” Nke a bụ iji mezuo okwu ahụ o kwuru na mbụ, “Etufughị m onye ọbụla nʼime ndị ahụ i nyere m.”
Kesaa
JỌN 18 BIU