JỌN 15:15-16
JỌN 15:15-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m. Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m.
Kesaa
Gụọ JỌN 15JỌN 15:15-16 Bible Nso (IGBOB)
Akpọkwaghm unu ndi-orù ọzọ site n'ub͕u a; n'ihi na orù adighi-amara ihe onye-nwe-ya nēme: ma akpọwom unu ndi-eyì; n'ihi na ihe nile M'nuru site n'ọnu Nnam ka M'mere ka unu mara. Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n'aham, ka O we nye unu ya.
Kesaa
Gụọ JỌN 15