Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 14:8-21

JỌN 14:8-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.” Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’ Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya. Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m. Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya. “Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile. Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu. Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ. Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu. Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.”

JỌN 14:8-21 Bible Nso (IGBOB)

Filip si Ya, Onye-nwe-ayi, gosi ayi Nna ahu, ọ gēzu-kwa-ra ayi. Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu? Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n'Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya. Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n'ihi ọlum onwe-ha. N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n'ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam. Ihe ọ bula unu gāriọ kwa n'aham, ihe ahu ka M'gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara-Ya. Ọ buru na unu gāriọm ihe ọ bula n'aham, nke ahu ka M'gēme. Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu. Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mb͕e ebighi-ebi, bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n'ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n'ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu. M'gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu. Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n'ihi na Mu onwem nādi ndu. N'ubọchi ahu unu onwe-unu gāmara na Mu onwem nọ nime Nnam, na unu onwe-unu nọ kwa nimem, na Mu onwem nọ kwa nime unu. Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.