JỌN 14:2-4
JỌN 14:2-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi? Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ. Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”
Kesaa
Gụọ JỌN 14JỌN 14:2-4 Bible Nso (IGBOB)
N'ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M'gāgwawori unu; n'ihi na anamaga idoziri unu ebe. Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ. Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya.
Kesaa
Gụọ JỌN 14