JỌN 12:9-11
JỌN 12:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie. Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.
Kesaa
Gụọ JỌN 12JỌN 12:9-11 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere ọra madu n'etiti ndi-Ju mara na Ọ nọ n'ebe ahu: ha we bia, ọ bughi n'ihi nání Jisus, kama ka ha we le kwa Lazarọs, onye Ọ mereri ka o si na ndi nwuru anwu bilie. Ma ndi-isi-nchu-àjà b͕ara ìzù ka ha we b͕u kwa Lazarọs; n'ihi na ọ bu n'ihi ya ka ọtutu nime ndi-Ju nāpu, nēkwere kwa na Jisus.
Kesaa
Gụọ JỌN 12