JỌN 1:40-46
JỌN 1:40-46 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita. Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst). Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita). Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.” Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita. Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.” Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?” Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.”
JỌN 1:40-46 Bible Nso (IGBOB)
Otù nime madu abua ahu ndi nuru okwu si n'ọnu Jọn puta, ndi so-kwa-ra Ya, bu Andru, nwa-nne Saimon. Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist). O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya). N'echi-ya Ọ chọrọ ipu ga Galili, O we hu Filip: Jisus we si ya, Som. Ma Filip bu onye Betsaida, onye si n'obodo Andru na Pita puta. Filip we chọta Nataniel, si ya, Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe bayere Ya n'akwukwọ iwu, Onye ndi-amuma dekwara ihe bayere Ya, Jisus Onye Nazaret, Nwa Josef. Nataniel we si ya, Ọ̀ di ezi ihe ọ bula puru isi na Nazaret puta? Filip si ya, Bia le.