JỌN 1:1-5
JỌN 1:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke. Ya na Chineke nọ site na mbụ. E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya. Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile, ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya.
Kesaa
Gụọ JỌN 1JỌN 1:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke. Onye ahu na Chineke diri na mbu. Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya. Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu. Ìhè ahu we nāmu n'ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya.
Kesaa
Gụọ JỌN 1