JEREMAIA 9:3-9
JEREMAIA 9:3-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta, ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ; Ọ bụghị site nʼeziokwu ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ. Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ; ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,” otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara. “Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ. Enyi na-aghọgbu enyi ya, ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu. Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha; ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie. I bi nʼetiti aghụghọ. Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara. Ya mere, ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m? Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”
JEREMAIA 9:3-9 Bible Nso (IGBOB)
Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Lezienu anya, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, unu atukwasi-kwa-la nwa-nne ọ bula obi: n'ihi na nwa-nne ọ bula nējidesi ikiri-ukwu nwa-nne-ya ike, ọzọ, onye-ab͕ata-obi ọ bula nējeghari nāb͕a àmà ọjọ. Ha nākwa kwa emò, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, ma ezi-okwu ka ha nādighi-ekwu: ha ezíwo ire-ha ikwu okwu-ugha; ọ bu n'ime ajọ omume ka ike gwuru ha. Ebe-obibi-gi di n'etiti aghughọ; n'aghughọ ka ha juru imaram; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue otú a, si, Le, M'gaje inucha ha, we nwaputa ha; n'ihi na M'gēsi aṅa me n'ihi ada ndim? Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n'ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n'obi-ya ọ nēche ya anwu. M'gaghi-eleta ha n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ mba nke di otú a ọ́bọ̀?