Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 7:1-34

JEREMAIA 7:1-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe ONYENWE ANYị nọ bịakwute Jeremaya. “Guzo nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọ ONYENWE ANYị kwusaa ozi a nʼebe ahụ, “ ‘Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYị, unu ndị Juda niile, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a niile na-abata ife ONYENWE ANYị ofufe. Ihe ndị a bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu. Mezienụ ụzọ unu na omume unu niile, m ga-ekwe ka unu biri nʼebe a. Unu atụkwasịla uche unu nʼokwu aghụghọ niile a na-agwa unu na-asị, “Nke a bụ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị!” Ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu guzozie, ọ bụrụ na unu emesoo ibe unu mmeso nʼụzọ ikpe ziri ezi, ọ bụrụ na unu ahapụ imegbu ndị ọbịa, na ndị na-enweghị nna, maọbụ nwanyị di ya nwụrụ; ọ bụrụ na unu ajụ iwufu ọbara onye aka ya dị ọcha nʼebe a, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaso chi ndị ọzọ nke na-ewetara unu nsogbu, mgbe ahụ, aga m ekwere ka unu biri nʼebe a, nʼala a m nyere nna nna unu ha, ruo mgbe ebighị ebi. Ma lee, ihe unu na-eme ugbu a bụ ịtụkwasị uche unu nʼokwu aghụghọ nke na-enweghị isi. “ ‘Unu ga-aga nʼihu na-ezu ohi, na-egbu mmadụ ibe unu, na-akwa iko, ma na-eji chi ndị ọzọ na-aṅụ iyi? Unu ga-anọgide na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, ma na-agbaso chi ndị ọzọ unu na-amaghị? Unu ga-emecha bịa guzo nʼihu m nʼụlọnsọ a, nke a kpọkwasịrị aha m, na-asị, “Anyị nọ na nchekwa,” ọ bụ ịnọ na nchekwa maka ime ihe arụ niile ndị a? Ọ pụtara na ụlọ a, nke a kpọkwasịrị aha m aghọọla ogige nye ndị ohi? Ma anọkwa m ya na-ele unu anya, ka ONYENWE ANYị kwupụtara. “ ‘Otu ọ dị, biko, Jeruonụ ebe ahụ dị na Shaịlo, ebe ahụ m buru ụzọ mee ka ọ bụrụ ebe a kpọkwasịrị aha m, ka unu chọpụta ihe m mere ya nʼihi ajọ omume ndị m, ụmụ Izrel. Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka ONYENWE ANYị kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza. Nʼihi ya, ihe ahụ m mere na Shaịlo ka m ga-emekwa ọzọ megide ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. E, aga m eme ya megide ụlọnsọ ukwu ahụ unu na-atụkwasị obi unu nʼime ya, ụlọnsọ ukwu ahụ m nyere unu na nna nna unu ha. A ga-esite nʼihu m wezuga unu, tufuo unu, dịka m wezugara ma tufukwaa ụmụnna unu, bụ ndị Ifrem.’ “Ya mere, unu ekperela m ekpere nʼihi ndị a; unu atụfula oge unu ịrịọ m arịrịọ nʼihi ha. Agaghị m ege ntị nʼekpere na arịrịọ unu. Ọ bụ na unu adịghị ahụ ihe na-eme nʼobodo niile nke Juda, na ihe ha na-eme nʼokporoụzọ niile nke Jerusalem? Ụmụ na-achịkọta nkụ nke nna ha ji emenye ọkụ, ebe nne ha na-eghe achịcha ha na-eche nʼihu Eze nwanyị mbara Eluigwe. Ha na-awụpụrụ chi ndị ọzọ mmanya nʼihi ịkpasu m iwe. Ọ bụ m ka ha na-akpasu iwe? Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara. Ọ bụghị onwe ha ka ha na-emesi ike, ka ihe ihere mee ha? “ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị sịrị: Iwe m na ọnụma m ka a ga-awụkwasị nʼebe a, nʼelu ndị mmadụ, na anụmanụ, na osisi dị nʼọhịa, na mkpụrụ nke ala ubi. Ọ ga-ere ọkụ ma agaghị emenyụ ya. “ ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Gaanụ nʼihu, tụkwasịnụ aja nsure ọkụ unu nʼelu aja unu ndị ọzọ niile. Riekwanụ anụ ndị a nʼonwe unu. Nʼihi na mgbe m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha, gwa ha okwu, e nyeghị ha naanị iwu maọbụ gwa ha okwu banyere ịchụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Ma iwu m nyere ha bụ nke a, ruberenụ m isi, aga m abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị nke m. Bienụ ndụ nʼiwu niile m nyere unu, ka ihe gaara unu nke ọma. Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ. Site na mgbe nna nna unu ha hapụrụ ala Ijipt, esepụbeghị m aka izitere unu ndị amụma bụ ndị ohu m. Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’ “Mgbe ị gwara ha ihe ndị a niile, ha agaghị ege ntị. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ ha oku ha agaghị aza. Ya mere, ihe ndị a ka ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ mba na-enwebeghị oge ha ji rubere ONYENWE ANYị Chineke ha isi. O nwebekwaghị oge ọbụla ha ji nabata ịdọ aka na ntị ya. Eziokwu ọbụla adịghịkwa; okwu ọnụ ha bụ naanị ụgha ụgha. “ ‘Kpụchaanụ agịrị isi unu, tufuo ya, nọọnụ nʼebe dị elu nke tọgbọrọ nʼefu bulie abụ akwa, nʼihi na ONYENWE ANYị esitela nʼoke ọnụma ya jụ ọgbọ a. Ọ gbakụtala ha azụ bụ ọgbọ nke a iwe ya na-adakwasị. “ ‘ONYENWE ANYị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya. Ha ewuolara onwe ha ebe ịchụ aja dị elu na Tofet, nke dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ebe ahụ ka ha na-anọ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ọkụ. Ihe dị otu a abụkwaghị ụdị ihe m nyere ha nʼiwu ka ha mee. O nwekwaghị oge ihe dị otu a batara m nʼobi. Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe ndị mmadụ na-agaghị akpọkwa ebe ahụ Tofet maọbụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Kama ha ga-akpọ ya ndagwurugwu ogbugbu mmadụ, nʼihi na ha ga-eli ọtụtụ ndị ha na Tofet ruo mgbe ha na-agaghị ahụkwa ebe ha ga-eli ndị fọdụrụ. Mgbe ahụ, ozu ndị mmadụ ndị a ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha. Mgbe ahụ, aga m eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye nʼobodo niile nke Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem kwụsị. Ala ahụ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu.

JEREMAIA 7:1-34 Bible Nso (IGBOB)

Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si, Guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n'ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n'ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Menu ka uzọ nile nke unu na omume nile nke unu di nma, M'gēme kwa ka unu biri n'ebe a. Unu atukwasila obi-unu n'okwu-ugha nile, si, Ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ka ndi a bu. N'ihi na ọ buru na unu eme ka uzọ nile unu na omume nile unu dizue nma; ọ buru na unu emezue ihe ekpere n'ikpe n'etiti otù onye na ibe-ya; ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ: M'gēme kwa ka unu biri n'ebe a, n'ala nka nke M'nyere nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-egi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru. Le, unu onwe-unu nātukwasi obi-unu n'okwu-ugha nile, o we ghara ibara unu urù. Ùnu ganēzu ori, nēb͕u madu, nākwa iko, nāṅu iyi ugha, nēsurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nējeso chi ọzọ di iche iche nke unu nāmaghi, we bia guzo n'irum n'ulo a, nke akpọkwasiri aham, si, Anaputawo ayi; ka unu we me ihe-árú ndia nile? Ọ̀ bu ọb͕à ndi nēme ihe-ike ka ulo a, nke akpọkwasiri aham, ghọworo n'anya-unu? Ọbuná Mu onwem, le, ahuwom ya, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Otú ọ di, biko, jeruenu ọnọdum nke di na Shailo, ebe M'mere ka aham biri na mbu, hunu ihe M'mere ya n'ihi ihe ọjọ nke ndim, bú Israel. Ma ub͕u a, n'ihi na unu aluwo ọlu ndia nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'we gwa unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu, ma unu anughi; M'we kpọ unu òkù, ma unu azagh: M'gēme kwa ulo a, nke akpọkwasiri aham, nke unu onwe-unu nātukwasi obi, M'gēme kwa ọnọdu a nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, M'gēme ha dika M'gēme ha dika M'mere Shailo. M'gēsi kwa n'irum tufue unu, dika M'tufuru umu-nna-unu nile, bú nkpuru nile nke Efraim. Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha, ariọ-kwa-lam aririọ: n'ihi na M'gaghi-anānu olu-gi. Ì dighi-ahu ihe ndi ahu nēme n'obodo nile nke Juda na n'èzí nile nke Jerusalem? Umu-ha nāchikọta nkú, ndi bu nna nāfunwu ọku, ndinyom-ha nāgwọ utu ọka flour koro eko, imere eze-nwanyi nke elu-igwe achicha, na iwusiri chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe. Ọ̀ bu Mu ka ndi ahu nākpasu iwe? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ọ̀ bughi ha onwe-ha ka ha nākpasu iwe, ka ihere we me ha n'iru? N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, iwem na ọnumam ka anāwusi n'ebe a, n'aru madu, na n'aru anu-ulo, na n'aru osisi ọhia, na n'aru nkpuru nke ala-ubi; ọ gēre kwa ọku, agaghi-emenyu kwa ya. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Tukwasinu àjà-nsure-ọku nile unu n'elu àjà nile unu, ri-kwa-nu anu. N'ihi na agwaghm nna-unu-hà okwu, enyeghkwam ha iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta, bayere ihe nile nke àjà-nsure-ọku na nke àjà ọzọ: kama ọ bu okwu a ka M'nyere ha n'iwu, si, Genu nti olum, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n'uzọ nile nke M'nēnye unu n'iwu, ka o we diri unu nma. Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha-n'ala, ha we jegharia na ndum-ọdu nile na n'isi-ike nke obi ọjọ ha, ha we daghachi azu, ghara iga n'iru. Site n'ubọchi ahu nke nna-unu-hà ji si n'ala Ijipt puta rue ta ka M'nēzitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha kwa-ubọchi: ma ha egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike: ha mere ihe ọjọ kari ndi bu nna-ha. I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi. I gāsi kwa ha, Nka bu mba ahu nke nēgeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, nke nānaraghi kwa idọ-aka-na-nti: ikwesi-ntukwasi-obi alawo n'iyì, ebipuwo kwa ya n'ọnu-ha. Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya. N'ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n'anyam; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya. Ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Tofet, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, isure umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'ọku; bú ihe nke M'nēnyeghi n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim. N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ya Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u: ha gēlì kwa ozu na Tofet n'ihi na ebe ilì ozu adighi. Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha. M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.