JEREMAIA 42:1-22
JEREMAIA 42:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo ONYENWE ANYị Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole. Kpee ekpere ka ONYENWE ANYị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.” Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere ONYENWE ANYị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile ONYENWE ANYị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.” Ha sịrị Jeremaya, “Ka ONYENWE ANYị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile ONYENWE ANYị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị. Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere ONYENWE ANYị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.” Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu ONYENWE ANYị ruru Jeremaya ntị. Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị: ‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu. Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya. Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’ “Ma ọ bụrụ na unu onwe unu asị, ‘Anyị agaghị anọgide nʼala a,’ si otu a nupu isi nʼebe ONYENWE ANYị Chineke unu nọ; ọ bụrụkwa na unu asị, ‘Mba, anyị ga-aga biri nʼala Ijipt ebe anyị na-agaghị ahụ agha, maọbụ nụ ụda opi ike, maọbụ nọọ agụụ nʼihi enweghị ihe oriri,’ mgbe ahụ, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYị, unu ndị fọdụrụ na Juda. Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike na mkpebi unu ịga Ijipt ibiri nʼebe ahụ, ọ bụrụkwa na unu agaa biri nʼIjipt nʼeziokwu, mgbe ahụ, mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-eru unu nʼahụ, ụnwụ ahụ unu na-atụ oke egwu ya ga-esoro unu baa nʼIjipt. Unu ga-anwụkwa nʼebe ahụ. Nʼezie, ndị ahụ niile kpebiri ịga biri nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe. O nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.’ Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’ “Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na ONYENWE ANYị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị, na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta ONYENWE ANYị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị ONYENWE ANYị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’ Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile ONYENWE ANYị Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru. Ya mere, matanụ ya nke ọma taa na unu ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe, nʼebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”
JEREMAIA 42:1-22 Bible Nso (IGBOB)
Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na Johanan nwa Karea, na Jezanaia nwa Hoshaia, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, we biarue nso, si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gosi ayi uzọ ahu nke ayi gēje ije nime ya, na ihe ayi gēme. Jeremaia, bú onye-amuma, we si ha, Anuwom; le, m'gaje ikpere Jehova, bú Chineke-unu, ekpere, dika okwu nile nke unu si di; ọ gēru kwa na ihe ọ bula nke Jehova gāza unu, m'gēgosi unu ya; m'gaghi-eb͕ochinari unu ihe ọ bula. Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n'etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme. Ma ọ di nma ma ọ jọrọ njọ, olu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēge nti, bú Onye ayi onwe-ayi nēziga gi ijekuru; ka o we diri ayi nma, mb͕e ayi nēge nti olu Jehova, bú Chineke-ayi. O rue, mb͕e ubọchi iri gwusiri, na okwu Jehova ruru Jeremaia nti. O we kpọ Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, Onye unu zigaram ijekuru ime ka aririọ-amara-unu da n'iru Ya, siri: Ọ buru na unu ebiri n'ala nka, M'gēwu kwa unu dika ulo, ghara ikwada unu, M'gāku kwa unu dika osisi, ghara iropu unu: n'ihi na echeghariwom n'ihe ọjọ ahu nke M'meworo unu. Unu atula egwu eze Babilon, onye unu onwe-unu nātu egwu ya; unu atula egwu ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na unu ka M'nọyere, izọputa unu, na inaputa unu n'aka-ya. M'gēnye kwa unu ka enwe obi-ebere nile n'aru unu, ka o we nwe obi-ebere n'aru unu, me ka unu lata n'ala-unu. Ma ọ buru na unu onwe-unu asi, Ayi agaghi-ebi n'ala nka; unu ewe ghara ige nti olu Jehova, bú Chineke-unu; si, É-è; kama ọ bu n'ala Ijipt ka ayi gābà, ebe ayi nāgaghi-ahu agha, ayi agaghi-anu kwa olu opì-ike, agu ihe-oriri agaghi-agu kwa ayi; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ayi gēbi: ma ub͕u a n'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi Juda fọduru: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Ọ buru na unu onwe-unu edosie iru-unu ike ibà n'Ijipt, unu ewe ba inọ dika ọbìa n'ebe ahu; ọ gēru kwa, na mma-agha ahu nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gēru unu aru n'ala Ijipt; ọzọ, oké unwu ahu, nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gārapara unu n'aru n'iso unu n'azu n'Ijipt; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu. Ọ bu kwa otú a ka ndikom ahu nile gādi, bú ndi doworo iru-ha ibà n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu; ha gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ha agaghi-enwe kwa ndi fọduru ma-ọbu ndi b͕apuru ab͕apu n'iru ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ha. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ. Jehova ekwuwo okwu bayere unu, unu ndi Juda fọduru, si, Unu abàla n'Ijipt: maranu nke-ọma na ab͕aworom unu àmà ta. N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya: m'we gosi unu ya ta; ma unu egeghi nti n'olu Jehova, bú Chineke-unu, ọbuná ime ihe ọ bula nke O zìrim ka m'were ya biakute unu. Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n'ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n'ebe ahu.