JEREMAIA 38:9-10 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JEREMAIA 38:9-10 IGBOB (Bible Nso)
Onye-nwem eze, ndikom ndia emewo ihe ọjọ n'ihe nile nke ha meworo Jeremaia, bú onye-amuma, onye ha tubàworo n'olùlù ahu; o we nọ n'ọnwu n'ọnọdu-ya n'ihi oké unwu: n'ihi na nri adighi kwa ọzọ n'obodo a. Eze we nye Ebed-melek, bú onye Etiopia, iwu, si, Si n'ebe a chiri orú ndikom na iri n'aka-gi, me ka Jeremaia, bú onye-amuma, si n'olùlù ahu rigoputa, tutu ọ nwua.
Kesaa
JEREMAIA 38 IGBOBJEREMAIA 38:9-10 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.” Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.”
Kesaa
JEREMAIA 38 BIU