Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 33:6-7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JEREMAIA 33:6-7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla. Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ.

JEREMAIA 33:6-7 IGBOB (Bible Nso)

Le, M'gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n'aru ya, ya na ngwọta, M'gāgwọta kwa ha; M'gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu. M'gēme kwa ka ndi Juda adọtara n'agha na ndi Israel adọtara n'agha lata, M'gēwu kwa ha dika ulo, dika na mbu.