JEREMAIA 32:36-41
JEREMAIA 32:36-41 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ihe i kwuru banyere obodo a bụ, ‘A ga-esite na mma agha, na nʼụnwụ, na nʼoke ọrịa, nyefee ha nʼaka eze Babilọn,’ ma ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel kwuru, Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ha. Agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma, aga m akwalikwa obi ha ịtụ egwu m. Nʼụzọ dị otu a, ha agaghị esitekwa nʼiso m wezuga onwe ha. Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a.
JEREMAIA 32:36-41 Bible Nso (IGBOB)
Ma ub͕u a n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n'aka eze Babilon site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: si, Le, M'gaje ichikọputa ha n'ala nile, ebe M'chugaworo ha n'iwem, na n'ọnumam, na n'oké iwe di uku; M'gēme kwa ka ha lata n'ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma: Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha. Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.