JEREMAIA 31:15-17
JEREMAIA 31:15-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ndị a bụ ihe ONYENWE ANYị kwuru, “A nụrụ otu olu na Rema, iru ụjụ na oke ịkwa akwa. Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.” Ma otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, “Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara. “Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa. Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.
JEREMAIA 31:15-17 Bible Nso (IGBOB)
Otú a ka Jehova siri: Olu nime Rema ka anuru, bú abù-ákwá, na ikwa-ákwá nēlu ilu nke-uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; ọ juwo na agaghi-akasi ya obi bayere umu-ya, n'ihi na ha adighi. Otú a ka Jehova siri: Jide olu-gi ka ọ ghara ikwa ákwá, jide kwa anya-gi abua ka ha ghara ib͕a anya-miri: n'ihi na ugwọ-ọlu di agākwu gi n'ọlu-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ha gēsi kwa n'ala onye-iro lata. Olile-anya di-kwa-ra ọdi-n'iru-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); umu-gi gālata kwa n'ókè-ala-ha.