Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 25:1-14

JEREMAIA 25:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn. Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem: Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu ONYENWE ANYị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu. Ọ bụkwa ezie na ONYENWE ANYị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu. Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a ONYENWE ANYị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi. Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ. “Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.” Ya mere, ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m. Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya. Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa. “Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche. A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”

JEREMAIA 25:1-14 Bible Nso (IGBOB)

Okwu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi Juda nile n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda; nke ahu bu arọ mbu nke Nebukadreza, bú eze Babilon; bú okwu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara ndi Juda nile, gwa ndi nile bi na Jerusalem, si: Site n'arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m'we gwa unu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu anughi. Jehova ezitewo-kwa-ra unu ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha; ma unu anughi, unu atọghi kwa nti-unu n'ala inu; nāsi, Biko, latanu, onye ọ bula ya si n'uzọ ọjọ ya na n'ihe ọjọ nke omume nile unu lata, biri-kwa-nu n'elu ala nke Jehova nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru: unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha na ikpọ isi ala nye ha, unu eji-kwa-la ọlu aka-unu kpasum iwe; M'gaghi-eme kwa unu ihe ọjọ. Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ. N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a: N'ihi na unu anughi okwum nile, le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi. Ọzọ, M'gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n'iyì. Ala nka nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe na ihe-iju-anya; mba ǹdia gēfè kwa eze Babilon ọgu arọ na iri. O gēru kwa, mb͕e ọgu arọ na iri ruzuru, na M'gēwere ajọ omume ha leta eze Babilon, leta kwa mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), leta kwa ala Kaldea; M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi. M'gēme kwa ka okwum nile biakwasi ala ahu, bú okwu nke M'kwuworo megide ya, bú amuma nile edeworo n'akwukwọ a, nke Jeremaia buworo megide mba nile. N'ihi na ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ha fè ha òfùfè, ọbuná ha onwe-ha: M'gākwughachi kwa dika omume nile ha si di, na dika ọlu nke aka-ha si di.