Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 22:15-16 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JEREMAIA 22:15-16 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma. O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nke a mere na ihe niile gara nke ọma. Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? Ka ONYENWE ANYị kwupụtara

JEREMAIA 22:15-16 IGBOB (Bible Nso)

Ì gābu eze, n'ihi na gi onwe-gi nānu ọku n'obi ika ndi ọzọ n'iji osisi cedar ewu ulo? nna-gi, ò righi ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume? mb͕e ahu ka ọ diri ya nma. O kpere ikpe onye ewedara n'ala na ob͕enye; mb͕e ahu ka ọ di nma. Nka abughi imaram? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.