Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 21:8-9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JEREMAIA 21:8-9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ. Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.

JEREMAIA 21:8-9 IGBOB (Bible Nso)

Ndi nka ka i gāsi kwa, Otú a ka Jehova siri: Le, M'nēche n'iru unu uzọ ndu na uzọ ọnwu. Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpu apu, nke nādakuru ndi Kaldea ndi nānọchigide unu n'agha, ọ gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata.