Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 13:1-27

JEREMAIA 13:1-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.” Ejere m zụta ajị ahụ dịka ONYENWE ANYị kwuru, kee ya nʼukwu m. Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m, “Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.” Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka ONYENWE ANYị gwara m. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ONYENWE ANYị gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.” Ya mere, agara m Yufretis, gwupụta ajị ahụ site nʼebe m zoro ya, ma mgbe m wepụtara ya, ahụrụ m na o mebiela, na ọ bakwaghị uru ọbụla. Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYị ruru m ntị, sị, “Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, ‘Nʼotu aka ahụ, mụ onwe m ga-ebibi mpako Juda na oke mpako Jerusalem. Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla. Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara. Sị ha, “Otu a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel kwuru: A ga-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya. Ọ bụrụ na ha sị gị, ‘Ọ bụ na anyị amaghị na a na-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya?’ Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem. Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’ ” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri. Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na ONYENWE ANYị ekwuola ya. Nyenụ ONYENWE ANYị Chineke unu nsọpụrụ. Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu; tupu unu akpọbie ụkwụ unu nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị. Unu na-ele anya ìhè ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị. Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ. Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ ONYENWE ANYị ka a ga-adọta nʼagha. Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.” A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ. Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi? Gịnị ka ị ga-asị mgbe ONYENWE ANYị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme? Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile. Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe. “Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị. Nke a bụ ihe unu fetara na nza, oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri. “Nʼihi na unu echefuola m, tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche. Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị. Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị, na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile! Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile, nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa. Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem! Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”

JEREMAIA 13:1-27 Bible Nso (IGBOB)

Otú a ka Jehova sirim, Je, zutara onwe-gi ihe-ọkiké nke flax, tukwasi ya n'úkwù-gi, ma emela ka ọ ba na miri. M'we zuta ihe-ọkiké dika okwu Jehova si di, m'we tukwasi ya n'úkwù. Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, Were ihe-ọkiké ahu nke i zutaworo, nke di n'úkwù-gi, bilie, je Yufretis, zobe ya n'ebe ahu nime nb͕awa nke nkume di elu. M'we je, zobe ya n'akuku Yufretis, dika Jehova nyerem iwu. O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe ahu, bú nke M'nyere gi iwu izobe n'ebe ahu. M'we je Yufretis, gwue, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe m'zobere ya-ri: ma, le, ihe-ọkiké ahu ebibiwo, ọ bàghi n'ihe ọ bula. Okwu Jehova we ruem nti, si, Otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēbibi npako Juda na npako bara uba nke Jerusalem. Ndi ọjọ nka ndi nāju inu okwum nile, ndi nējeghari n'isi-ike nke obi-ha, we jeso chi di iche iche ọzọ ifè ha, na ikpọ isi ala nye ha, ndi nka gādi kwa ka ihe-ọkiké a, nke nādighi-abà n'ihe ọ bula. N'ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n'úkwù madu, otú a ka M'meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n'arum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi. I gāgwa kwa ha okwu a, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Agāb͕aju ite ọ bula manya-vine: ha gāsi kwa gi, Ọ̀ bu na ayi amaghi na agāb͕aju ite ọ bula manya-vine? I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n'ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem. M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha. Nurunu, ge kwa nti; unu adila elu n'obi: n'ihi na Jehova ekwuwo. Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri. Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n'ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n'anyam nke-uku, anya-miri ewe si n'anyam rùda, n'ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n'agha. Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu. Emechiwo obodo nile nke Negeb, ọ dighi kwa onye nēmeghe ha: emewo ka Juda je biri n'ala ọzọ, ha nile emezuwo ka ọ je biri n'ala ọzọ. Welie anya-unu, hu ndi nēsi n'Ugwu bia: òle ebe ìgwè aturu enyere gi, bú ìgwè ewu na aturu-gi mara nma? Gini ka i gāsi, mb͕e Ọ gēwere nmehie-gi leta gi, ebe gi onwe-gi zíworo ndi ahu imegide gi, bú ezi ndi-eyì-gi, ka ha buru ndi-isi-gi? ihe-nb͕u di iche iche, hà agaghi-ejidesi gi ike, dika nwanyi ime nēme? Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike. Onye Etiopia, ọ̀ gāb͕anwe akpukpọ-aru-ya? ma-ọbu agu, ọ̀ gāb͕anwe agwa-ya? ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ. M'gāchusa kwa ha, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke nāgabiga, nye ifufe ọzara. Nka bu ihe efetara gi na nzà, òkè nke atùworo nye gi site nam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na i chezọwo Mu onwem, we tukwasi okwu-ugha obi-gi. Ya mere Mu onwem ji kpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi rue iru-gi, ewe hu nlelì-gi. Ikwa-iko-gi nile, na ọbube-gi nile dika inyinya, nzube ọjọ nke ikwa-iko-gi, n'elu ugwu ntà nile n'ọhia, ahuwom ihe-árú-gi nile ndia. Ahuhu diri gi, Jerusalem! i gaghi-adi ọcha; #mb͕e ole gāgabiga tutu ọ di?