JEREMAIA 10:23-24 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JEREMAIA 10:23-24 IGBOB (Bible Nso)
Jehova, amawom na ọ bughi n'aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike. Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n'ikpé; adọlam aka na nti n'iwe-gi, ka I we ghara ibilatam.
Kesaa
JEREMAIA 10 IGBOBJEREMAIA 10:23-24 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O ONYENWE ANYị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso. Ya mere, ONYENWE ANYị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị, ma ọ bụghị site nʼiwe gị, ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.
Kesaa
JEREMAIA 10 BIU