JEREMAIA 1:17-19
JEREMAIA 1:17-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha. Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ. Ha ga-agbalị ka ha megide gị, ma ha agaghị emeri gị. Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m anapụtakwa gị.” Otu ka ONYENWE ANYị kwubiri ya.
JEREMAIA 1:17-19 Bible Nso (IGBOB)
Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n'iwu: atula ujọ ha, ka M'we ghara ime ka i tu ujọ n'iru ha. Ma Mu onwem, le, ewerewom i nye ta ibu obodo ewusiri ike, na ibu ide ígwè, na ibu mb͕idi ọla, imegide ala nka nile, imegide eze nile nke Juda, imegide ndi-isi-ya, imegide ndi-nchu-àjà-ya, na imegide ndi ala ahu. Ha gēbuso kwa gi agha; ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), inaputa gi.