NDI-IKPE 2:7-9
NDI-IKPE 2:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị Izrel fere ONYENWE ANYị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, bụkwa ndị hụrụ ọrụ ukwuu niile nke ONYENWE ANYị rụụrụ ndị Izrel. Ma Joshua, nwa Nun, onyeozi ONYENWE ANYị nwụrụ, mgbe ọ gbara otu narị afọ, na afọ iri. E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, nʼobodo Timnat Heres, nʼala ugwu ugwu nke ebo Ifrem, nʼụzọ mgbago ugwu Gaash.
NDI-IKPE 2:7-9 Bible Nso (IGBOB)
Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel. Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, we nwua, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri. Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-heres, n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash.