Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 2:10-15 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

NDI-IKPE 2:10-15 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị ONYENWE ANYị maọbụ ihe ndị nke o mere nye ụmụ Izrel. Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYị site nʼife Baal ofufe. Ha gbakụtara ONYENWE ANYị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo ONYENWE ANYị iwe. Ha gbakụtara ONYENWE ANYị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe. Ya mere, ONYENWE ANYị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide. Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka ONYENWE ANYị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu.

NDI-IKPE 2:10-15 IGBOB (Bible Nso)

Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel. Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim òfùfè: ha we rapu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt puta, ha we jezo chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ ha gburugburu, ha we kpọ isi ala nye ha: we kpasue Jehova iwe. Ha we rapu Jehova, fè Baal na Ashtarot òfùfè. Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, ha we punara ha ihe, O renye kwa ha n'aka ndi-iro-ha gburugburu, ha apughi kwa iguzo n'iru ndi-iro-ha ọzọ. Ebe ọ bula ha puru, aka Jehova adigide ha ime ha ihe ọjọ, dika Jehova kwuru, na dika Jehova ṅuru ha iyi: ewe kpab͕ue ha nke-uku.