NDI-IKPE 13:2-3
NDI-IKPE 13:2-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. Otu ụbọchị, mmụọ ozi ONYENWE ANYị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.
Kesaa
Gụọ NDI-IKPE 13NDI-IKPE 13:2-3 Bible Nso (IGBOB)
Ma otù nwoke nke Zọra di, sitere n'ab͕uru ndi Dan, aha-ya bu Manoa; ma nwunye-ya bu nwanyi-àgà, ọ mughi kwa nwa. Mọ ozi nke Jehova we me ka nwayi ahu hu ya anya, si ya, Biko, le, gi onwe-gi bu nwayi-àgà, i mughi kwa nwa: ma i gāturu ime, mua nwa-nwoke.
Kesaa
Gụọ NDI-IKPE 13