NDI-IKPE 13:1-5 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI-IKPE 13:1-5 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu ONYENWE ANYị. Nʼihi nke a, ONYENWE ANYị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ. Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. Otu ụbọchị, mmụọ ozi ONYENWE ANYị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa. Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ. Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.”
NDI-IKPE 13:1-5 IGBOB (Bible Nso)
Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ; Jehova we nye ha n'aka ndi Filistia ọgu arọ abua. Ma otù nwoke nke Zọra di, sitere n'ab͕uru ndi Dan, aha-ya bu Manoa; ma nwunye-ya bu nwanyi-àgà, ọ mughi kwa nwa. Mọ ozi nke Jehova we me ka nwayi ahu hu ya anya, si ya, Biko, le, gi onwe-gi bu nwayi-àgà, i mughi kwa nwa: ma i gāturu ime, mua nwa-nwoke. Ma ub͕u a, biko, lezie anya, aṅu-kwa-la manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na, le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke: aguba agaghi-aga n'elu isi-ya: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ: ya onwe-ya gāmalite kwa izọputa Israel n'aka ndi Filistia.