NDI-IKPE 11:1-40
NDI-IKPE 11:1-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu ọ dị, Jefta, onye Gilead, bụ dimkpa nʼagha. Nna ya bụ Gilead; nne ya bụ akwụna. Nwunye Gilead mụtaara ya ọtụtụ ụmụ ndị ikom ọzọ. Mgbe ha tolitere, ha chụpụrụ Jefta site nʼobodo ahụ, sị ya, “Ị gaghị eketa ihe ọbụla nʼezi nna anyị, nʼihi na nwa nwanyị ọzọ ka ị bụ.” Nʼihi nke a, Jefta gbapụrụ site nʼụlọ nna ya, gaa biri nʼobodo Tob. Mgbe na-adịghị anya, ọtụtụ ndị isi na-anụ ọkụ bịara nọnyere ya ma sorokwa ya. O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha. Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob. Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.” Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?” Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.” Jefta zara, “A sịkwarị na m esoro unu gaa lụso ndị Amọn agha, ọ bụrụ na ONYENWE ANYị enyefee ha nʼaka m, m ga-abụ onyeisi unu nʼezie?” Ndị okenye Gilead zara, “ONYENWE ANYị bụ onye akaebe, na anyị aghaghị ime dịka i kwuru.” Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu ONYENWE ANYị nʼobodo Mizpa. Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?” Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.” Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn, na-asị, “Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha. Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh. Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh. “Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya. “Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’ Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha. “Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ. Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan. “Ma ugbu a, ONYENWE ANYị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ? Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla ONYENWE ANYị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta. Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha? Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ? Emegideghị m gị, kama ọ bụ gị na-emejọ m, site nʼibuso m agha. Ka ONYENWE ANYị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebie ikpe a taa nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọn.” Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya. Nʼoge ahụ, mmụọ ONYENWE ANYị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha. Jefta kwere ONYENWE ANYị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m, ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke ONYENWE ANYị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.” Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. ONYENWE ANYị nyekwara ya mmeri dị ukwuu. O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn. Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ. Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m ONYENWE ANYị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.” Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere ONYENWE ANYị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere ONYENWE ANYị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.” Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru. Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwutere nna ya, onye ji ya mezuo nkwa ahụ o kwere. Ọ bụ nwaagbọghọ na-amatabeghị nwoke. Malite nʼoge ahụ ka ọ ghọrọ omenaala ndị Izrel, na ụmụ agbọghọ na-apụ kwa afọ, gaa, nọọ abalị anọ nʼihi icheta ada Jefta, onye Gilead.
NDI-IKPE 11:1-40 Bible Nso (IGBOB)
Ma Jefta, bú onye Gilead, bu dike nke bu dìnkpà, ma ya onwe-ya bu nwa nwayi nākwa iko: ma Gilead muru Jefta. Nwunye Gilead we muara ya umu-ndikom; nwunye-ya we tolite, chupu Jefta, si ya, I gaghi-eketa ihe n'ulo nna-ayi; n'ihi na nwa nwayi ọzọ ka i bu. Jefta we b͕apu n'iru umu-nne-ya, biri n'ala Tob: ndikom efu we chikọta onwe-ha n'ebe Jefta nọ, ha we soro ya pua. O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na umu Amon busoro Israel agha. O rue, mb͕e umu Amon busoro Israel agha, na ndi-okenye Gilead jere ikuputa Jefta n'ala Tob: ha we si Jefta, Bia, buru ayi onye-ọchi-agha, ka ayi we buso umu Amon agha. Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ùnu onwe-unu akpọghm asì, chupukwam n'ulo nnam? ma gini mere unu biakuteworom ub͕u a mb͕e unu nọ na nkpab͕u? Ndi-okenye Gilead we si Jefta, N'ihi nka ka ayi biaghachikuteworo gi ub͕u a, ka i we soro ayi je, buso umu Amon agha, i gāghọ-kwa-ra ayi onye-isi, bú ndi nile bi na Gilead. Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ọ buru na unu eme ka m'lata ibuso umu Amon agha, ọ buru kwa na Jehova arara ha nye n'irum, mù onwem gāghọrọ unu onye-isi? Ndi - okenye Gilead we si Jefta, Jehova bu onye nānu okwu a n'etiti ayi, ma ọ buru na ayi emeghi otú a, dika okwu-gi nile si di. Jefta we jeso ndi-okenye Gilead, ndi ahu we mee ya onye-isi na onye-ọchi-agha ichi ha: Jefta we kwue okwu-ya nile n'iru Jehova nime Mizpa. Jefta we ziè ndi-ozi jekuru eze umu Amon, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, na i biakutewom ibuso alam agha? Eze umu Amon we si ndi-ozi Jefta, N'ihi na Israel were alam, mb͕e o si n'Ijipt rigota, site n'Anon we rue Jabok, ru kwa Jọdan: ma ub͕u a nyeghachi ala ahu nile n'udo. Jefta we zì kwa ndi-ozi jekuru eze umu Amon ọzọ: ọ si ya, Otú a ka Jefta siri, Israel eweghi ala Moab ma-ọbu ala umu Amon: n'ihi na mb͕e ha siri n'Ijipt rigota, Israel we je ije n'ọzara rue Oké Osimiri Uhie, biarue Kedesh; Israel we zìe ndi-ozi jekuru eze Edom, si, Biko, ka m'gabiga nime ala-gi: ma eze Edom egeghi nti. Ọzọ kwa, o ziri ndi-ozi jekuru eze Moab: ma ọ kwegh: Israel we nọdu na Kedesh. O we je ije n'ọzara, ga ala Edom na ala Moab buruburu, biarue akuku ọwuwa-anyanwu ala Moab, ha we ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon; ma ha abaghi n'ókè-ala Moab, n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab. Israel we zìe ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, bú eze Heshbon; Israel we si ya, Biko, ka ayi gabiga nime ala-gi rue ebe nkem. Ma Saihon atukwasighi Israel obi igabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Jehaz, o buso Israel agha. Jehova, bú Chineke Israel, we nye Saihon na ndi-ya nile n'aka Israel, ha we tib͕ue ha: Israel we nweta ala nile nke ndi-Amorait, bú ndi bi n'ala ahu. Ha we nweta ókè-ala nile nke ndi-Amorait, site n'Anon we rue Jabok, site kwa n'ọzara we rue Jọdan. Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke Israel, anapuwo ndi-Amorait ala-ha n'iru ndi-Ya, bú Israel, ọ̀ bu kwa gi onwe-gi gēnweta ha? Ọ̀ bughi ihe Kemosh, bú chi-gi, nēme gi ka i nweta, ka i gēnweta? Ma onye ọ bula Jehova, bú Chineke - ayi, napuworo ala-ya n'iru ayi, nke ahu ka ayi gēnweta. Ma ub͕u a, gi onwe-gi, ì di nma ma-ọli kari Belak nwa Zipoa, bú eze Moab? ọ̀ chọrọ Israel okwu ma-ọli? ma-ọbu ò busoro ha agha ma-ọli? Mb͕e Israel biri na Heshbon na n'umu-obodo-ya, na n'Aroea na n'umu-obodo-ya, na n'obodo nile nke di n'akuku Anon, ọgu arọ iri-na-ise; gini mere unu anaputaghi kwa ha n'aka-ha na mb͕e ahu? Mu onwem emehieghi kwa megide gi, ma gi onwe-gi nēmem ihe ọjọ n'ibusom agha: Jehova, bú Onye-ikpe, gēkpe ikpe ta n'etiti umu Israel na umu Amon. Ma eze umu Amon egeghi nti okwu nile nke Jefta nke o zitere ya. Mọ nke Jehova we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpa Gilead, si na Mizpa nke Gilead gabiga rue umu Amon. Jefta we kwe Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye umu Amon n'akam n'ezie, o gēru kwa, na ihe ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulom puta izutem, mb͕e m'siri n'umu Amon lata n'udo, Jehova gēnwe ya, m'gēsure kwa ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku. Jefta we gabiga rue umu Amon ibuso ha agha; Jehova we nye ha n'aka-ya. Ọ we tib͕ue ha oké ntib͕u uku site n'Aroea we rue ebe i si ba Minit, bú orú obodo, ru kwa Ebel-Keramim. Ewe me ka umu Amon ruru ala n'iru umu Israel. Jefta we bia Mizpa rue ulo-ya, ma, le, nwa-ya nwayi chiri egwú-otiti na ite-egwú nāputa izute ya: ma nání nwata ahu bu otù nwa o nwere; ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi o nwere ma-ọbughi nání ya. O rue, mb͕e ọ huru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ewó, adam! i mewo ka m'ruru ala nke-uku, gi onwe-gi adiwo kwa n'etiti ndi nēmekpam aru: ma mu onwem, asaghepuworom Jehova ọnum, apughkwam ilaghachi azu. Ọ si ya, Nnam, i saghepuworo Jehova ọnu-gi; mem dika ihe ahu si di nke siworo n'ọnu-gi puta; ebe Jehova bọworo gi ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-gi, bú n'aru umu Amon. O we si nna-ya, Ka emem ihe a: ram aka ọnwa abua, ka m'we je rida rue n'elu ugwu, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke m'nọ, mu onwem na umu-ab͕ọghọ-ibem. Ọ si, Je. O we zipu ya ọnwa abua: o we je, ya onwe-ya na umu-ab͕ọghọ-ibe-ya, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ọ nọ n'elu ugwu. O rue, n'ọgwugwu ọnwa abua, na ọ laghachikuru nna-ya, o me ya nkwa-ya nke o kwere: nwata ahu amaghi kwa nwoke. O we buru ukpuru n'Israel, na umu-ndinyom Israel nēje kwa-arọ ikọ akukọ nwa-nwayi Jefta onye Gilead ubọchi anọ n'arọ.