JEMES 5:13-15
JEMES 5:13-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto. Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya.
JEMES 5:13-15 Bible Nso (IGBOB)
Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere. Ọ̀ di onye ọ bula nwere obi-utọ? ya bùa abù ọma. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nke aru-ya nādighi ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n'isi-ya, nēte ya manu olive n'aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādighi ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na o mehieworo, agāb͕aghara ya nmehie ahu.