JEMES 4:8-10
JEMES 4:8-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ. Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ. Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.
Kesaa
Gụọ JEMES 4JEMES 4:8-10 Bible Nso (IGBOB)
Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua. Hujunu anya, ru-kwa-nu újú, kwa-kwa-nu ákwá: ka ọchì-unu ghọ iru-újú, ka ọṅù-unu ghọ kwa nb͕aru-iru. Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.
Kesaa
Gụọ JEMES 4