JEMES 1:9-12
JEMES 1:9-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu. Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi. Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.
JEMES 1:9-12 Bible Nso (IGBOB)
Ma ka nwa-nna nke nọ n'ọnọdu di ala nya isi n'ọnọdu-ya di elu: ma ka ọgaranya nya isi na emere ya ka ọ la ala: n'ihi na dika uzari ahihia ọ gāgabiga. N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile. Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n'ọnwunwa: n'ihi na mb͕e anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahu, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya.