Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 65:1-25

AISAIA 65:1-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m. Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m. Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m, asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’ Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ nye ndị na-enupu isi, bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha, ndị na-anọgide na-akpasu m iwe nʼihu m mgbe niile, ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige, nʼebe ịchụ aja eji brik wuo, ndị na-anọdụ nʼetiti ili, ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche; ndị na-eri anụ ezi, ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha; ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso, nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’ Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m. Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị. “Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị: Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju. E, aga m akwụghachi ha. Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.” Otu a ka ONYENWE ANYị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile. Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ. Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike. “Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe ONYENWE ANYị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka. Aga m eme ka unu zute mma agha; unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu. Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị; mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị. Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu, họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.” Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị na-ekwu, “Ndị ohu m ga-eriju afọ, ma unu ga-anọ agụụ, akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ, ma ha ga-aṅụ mmiri. Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere, ma ha ga-anọ nʼọṅụ. Ndị ohu m ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha, ma unu ga-akwa akwa, nʼihi ihe mgbu nke obi unu, tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu. Unu ga-ahapụ aha unu nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ; nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị ga-etigbu unu, ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ. Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ, ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu, onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu. Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga, zokwa ha site nʼanya m. “Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla. Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ. Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa. “Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-adị nʼebe ahụ ọzọ, a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya; nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ dị ka nwantakịrị; a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ dịka onye a bụrụ ọnụ. Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya; ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha. Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ, maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie. Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge. Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta. Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ. Nʼihi na ha ga-abụ ndị ONYENWE ANYị gọziri, ha na ụmụ ụmụ ha. Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha. Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha. Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe, ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi, ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja! Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ, maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.” Ka Onyenwe anyị kwuru.

AISAIA 65:1-25 Bible Nso (IGBOB)

Ekwerem ka ndi nājughi ajuju chọm; ekwerem ka ndi nāchọsighm ike chọtam: asirim otù mba nke nākpọkughi aham, Lekwam. Ab͕asawom akam abua ogologo ubọchi nile nye otù ndi nke nēwezuga onwe-ha, ndi nēje ije n'uzọ nādighi nma, nēso èchìchè nile nke aka ha; bú ndi ahu nke nākpasum iwe n'irum mb͕e nile, nāchu àjà n'ubi nile agbara-ogige, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu brick nile; ndi nānọdu n'etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n'ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n'ihe-isi-ite nile ha; ndi nāsi, Guzoro onwe-gi iche, abiarula nsom, n'ihi na edowom i ihe nsọ: ndia bu anwuru-ọku n'imim, ọku nke nēre ogologo ubọchi nile. Le, ọ bu ihe edeworo n'akwukwọ n'irum: M'gaghi-agba nkiti, kama M'gākwughachi, e, M'gākwughachi n'obi-ha, ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n'otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ugwu nile, takwam uta n'elu ugwu ntà nile: M'gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n'obi-ha. Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n'uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n'ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M'gēme N'ihi ndi-orùm, ka M'we ghara ibibi ha nile. M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu. Sheron gāghọ kwa ebe-ita-nri nke ìgwè ewu na aturu, ndagwurugwu Ekoa gāghọ kwa ebe ìgwè ehi nāmakpu amakpu. diri ndim chọworom. Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa; M'gāgukọta unu nye mma-agha, unu nile gēruru kwa ala ka ewe b͕ue unu; n'ihi na akpọrọm unu òkù, ma unu azaghm; ekwurum okwu, ma unu anughi; unu we me ihe jọrọ njọ n'anyam abua, ọ bu kwa ihe nke nātọghm utọ ka unu rọputara. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji kwue otú a, si, Le, ndi-orùm gēri ihe, ma agu gāgu unu onwe-unu: le, ndi-orùm gāṅu, ihe-ọṅuṅu, ma akpiri gākpọ unu onwe-unu nku: le, ndi-orùm gāṅuri ọṅu, ma ihere gēme unu onwe-unu: le, ndi-orùm gēti nkpu ọṅù site n'obi di nma, ma unu onwe-unu gēti nkpu site n'ihe-nb͕u nke obi, unu gēsite kwa na ntiwa nke mọ-unu kwasi ákwá ike. Unu gārapu aha-unu n'azu ighọrọ ndi M'rọputaworo ihe-ọb͕ub͕a-iyi, Onye-nwe-ayi Jehova gēme kwa ka i nwua; ma Ọ gākpọ ndi-orù-Ya aha ọzọ: onye ahu nke nāgọzi onwe-ya n'uwa ewe gọzie onwe-ya nime Chineke nke ezi-okwu; onye ahu kwa nke nāṅu iyi n'uwa gēji Chineke nke ezi-okwu ṅua; n'ihi na echezọwo ahuhu mbu nile, na n'ihi na ezonariwo ha n'anyam abua. N'ihi na, le, M'gaje ikè elu-igwe ọhu na uwa ọhu: agaghi-echeta kwa ihe mbu nile, ha agaghi-abata kwa n'obi. Ma otú ọ di, ka obi tọ unu utọ, teghari-kwa-nu egwú ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi n'ihi ihe nke Mu onwem nēkè: n'ihi na, le, M'nēkè Jerusalem ibu ihe nteghari-egwú-ọṅù, ndi-ya kwa, ibu ihe obi-utọ. M'gēteghari kwa egwú ọṅù n'aru Jerusalem, obi gātọkwam utọ n'aru ndim: agaghi-anu kwa olu ikwa-ákwá nime ya ọzọ, ma-ọbu olu iti-nkpu. Ọ dighi nwa ọhu nwuchuru anwuchu gēsite kwa n'ebe ahu ọzọ, ma-ọbu agadi nke nānọzughi ubọchi ndu-ya: n'ihi na nwata gānwu mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise, agākọcha kwa onye-nmehie mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise. Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha. Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n'ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M'rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku. Ha agaghi-adọb͕u onwe-ha n'ọlu n'efu, ha agaghi-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n'ihi na nkpuru nke ndi Jehova gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi n'aru-ha puta. O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu. Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.