AISAIA 57:15-16
AISAIA 57:15-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi. Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị, maọbụ na-egosi iwe m. Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba, ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.
AISAIA 57:15-16 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu. N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo.