AISAIA 56:3-8
AISAIA 56:3-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na ONYENWE ANYị sị, “ONYENWE ANYị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.” Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike. Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya, ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi. Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru ONYENWE ANYị ijere ya ozi, na ịhụ aha ONYENWE ANYị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike, ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m. Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere nʼebe ịchụ aja m. Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”
AISAIA 56:3-8 Bible Nso (IGBOB)
Ka nwa ala ọzọ nke raparaworo na Jehova ghara ikwu okwu, si, Jehova aghaghi ikewapum na ndi-Ya: ka onozi ghara kwa isi, Le, mu onwem bu osisi kpọnwuru akponwu. N'ihi na otú a ka Jehova siri ndi-onozi ndi nēdebe ubọchi-izu-ikem nile, ndi rọputawo-kwa-ra ihe tọrọm utọ, ndi nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike: M'gēnye, ha n'ulom na nime mb͕idim nile ihe-ncheta na aha di nma kari umu-ndikom, kari kwa umu-ndinyom; aha ebighi-ebi ka M'gēnye ha n'otù n'otù, nke anāgaghi-ebipu. Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike; M'gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M'gēme kwa ka ha ṅuria n'ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n'elu ebe-ichu-àjàm: n'ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche. Ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi puta, bú Jehova Nke nāchikọta ndi Israel achupuru achupu, Ọ si, Ndi ọzọ di kwa M'gāchikọtara ya, chikọtara ndi-ya achikọtara achikọta.