AISAIA 53:2-6
AISAIA 53:2-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome, dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ. O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya. O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike. Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ. Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ. E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla. Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru, burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile, ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ. Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị: ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ. E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ; ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike. Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma ONYENWE ANYị ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile.
AISAIA 53:2-6 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na o tolitere n'iru Ya dika ome, na dika nkpọrọgwu nke putara n'ala kpọrọ nku: ọ dighi udi-aru oma ọ nwere, ọ dighi kwa ima-nma; ayi we hu ya, ma ọ maghi nma n'ile ya anya nke ayi gēji chọsie ya ike. Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n'ihe. N'ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n'onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n'ala. Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n'ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n'aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike. Ayi nile kpafuru akpafu dika ìgwè aturu: ayi chere iru, onye ọ bula n'uzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya.