AISAIA 47:10-11
AISAIA 47:10-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’ Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede.
AISAIA 47:10-11 Bible Nso (IGBOB)
I we tukwasi obi n'ihe ọjọ gi; i siwo, Ọ dighi onye nāhum; amam-ihe-gi na ihe-ọmuma-gi, nke ahu emewo ka i laghachi azu: i we si n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem. Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.