Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 44:21-28

AISAIA 44:21-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb, nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m. Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m; gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị. Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii, hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ. Lọghachikwute m, nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.” Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na ONYENWE ANYị emeela ya; tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala. Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile, unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị, nʼihi na ONYENWE ANYị agbapụtala Jekọb, na-egosikwa ebube ya nʼIzrel. “Otu a, ONYENWE ANYị na-ekwu, Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ: Mụ onwe bụ ONYENWE ANYị, Onye kere ihe niile, onye gbatipụrụ eluigwe, onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m, onye na-emebi ihe ịrịbama niile nke ndị amụma ụgha na-emekwa ka ndị na-ajụta ase ghọọ ndị nzuzu, onye na-ekpu ihe ọmụmụ ndị maara ihe ihu nʼala tụgharịa ya, ha ghọọ ihe nzuzu, onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuo meekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo, onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’ na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’ banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’ Onye ahụ na-asị, ogbu mmiri, ‘Takọrọ, aga m emekwa ka iyi ya niile takọrọsịa,’ Onye na-asị banyere Sairọs, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-emezukwa ihe niile na-adị m mma; Ọ ga-asịkwa banyere Jerusalem, “Ka ewugharịa ya,” ma banyere ụlọnsọ, “Ka ehiwe ntọala ya.” ’

AISAIA 44:21-28 Bible Nso (IGBOB)

Cheta ihe ndia, Jekob; gi Israel kwa, n'ihi na orùm ka i bu: akpuwom i; orù M'nwere ka i bu: Israel, M'gaghi-echezọ gi. Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i. Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n'ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n'Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma. Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye kpuworo gi site n'afọ nne-gi: Mu onwem bú Jehova, Onye nēme ihe nile; Onye náním nēseti elu-igwe; Onye nāb͕asa uwa; ọ̀ bu onye ka Mu na ya nọ? abum Onye nēmebi ihe-iriba-ama nile nke ndi-ekwukwu, M'nēme kwa ka ndi nāju ase wi ara; abum Onye nēme ka ndi mara ihe laghachi azu, M'nēme kwa ka ihe-ọmuma-ha ghọ ihe-nzuzu: abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa: Onye ahu Nke nāsi ob͕u-miri, Takọ; osimiri-gi nile ka M'gēme kwa ka ha tachasia: Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.