Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 41:1-29

AISAIA 41:1-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu! Ka mba niile gbanwee ike ha. Ka ha pụta kwuo okwu. Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe. “Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa, onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi? O weere mba niile nyefee ya nʼaka, meriekwa ndị eze nʼihu ya. O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu, jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị. Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla. E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ. Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya, na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite? Ọ bụ mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYị, onye dị siterị na mbido ihe niile, onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.” Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu; ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji. Ha zukọtara bịa nso. Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị, “Nwee obi ike.” Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda. “Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m. Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu. Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu. “Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi. Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu. Nʼihi na mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’ Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb, unu Izrel dị nta, atụla egwu, nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara, Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel. “Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze. Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha, meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka. Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYị, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel. “Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa, mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri, mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị ga-aza ha. Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ. Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta. Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ka ndị mmadụ hụ, matakwa, tuleekwa uche ma ghọta, na ọ bụ aka ONYENWE ANYị mere nke a, na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya. “Wepụtanụ mkpesa unu,” ka ONYENWE ANYị sịrị, “Doo okwu unu nʼusoro,” ka Eze nke Jekọb na-asịkwa. “Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị, ihe gaje ime. Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara, ka anyị nwee ike tulee ha matakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha. Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa, gwa anyị ihe ọdịnihu ji, ka anyị mara na unu bụ chi. Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ, nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu. Ma unu dị nta karịa ihe efu. Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru. Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ. “Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa. Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ. Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ, ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ. O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara, maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’? O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a, o nweghịkwa onye mere ka amata ya, o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla. Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’ Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma. Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ. O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ; o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha. Lee, ha niile bụ ụgha! Ọrụ ha niile pụtara ihe efu, arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.

AISAIA 41:1-29 Bible Nso (IGBOB)

B͕anu nkiti gem nti, unu agwe-etiti; ka ndi nile di iche iche b͕anwe kwa ike-ha: ka ha biarue nso; ka ha kwue okwu: ka ayi biarue onwe-ayi nso ikpe ikpe. Ònye kpọteworo otù onye site n'ọwuwa-anyanwu, onye Ọ kpọrọ n'ezi-omume ibiarute ukwu-Ya? Ọ nēwere mba di iche iche nye n'iru ya, Ọ nēme kwa ya ka ọ nwe ike n'aru ndi-eze: O nēwere ha nye mma-agha-ya dika ájá, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke anēfepu efepu, otú a ka Ọ nēwere ha nye uta-ya. Ọ nāchu ha, gabiga n'udo; o jighi ukwu-ya abà n'uzọ. ònye luworo ya, me ya, nākpọ ọb͕ọ nile site na mb͕e mbu? Ọ bu Mu onwem, bú Jehova, Onye mbu, Nke nọye-kwa-ra ndi ikpe-azu, Mu onwem bu Onye ahu. Agwe-etiti nile huru, we tua egwu; nsọtu nile nke uwa nāma jijiji: ha biaruru nso, we bia. Ha yeritara onwe-ha aka n'otù n'otù; onye ọ bula nime ha nāsi nwa-nne-ya, Di ike. Onye-ọ̀kà we me ka onye-nnucha-ọla di ike, onye ji otùtù akwọ ihe murumuru mere ka onye nētù osiama di ike, nēkwu okwu bayere nkpukọta, si, Nke ahu di nma: o were ǹtú kpọgidesi ya ike ka ewe ghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya. Ma gi onwe-gi, Israel, orùm, Jekob onye M'rọputara, nkpuru Abraham, bú onye nāhum n'anya; gi onye M'jidesiworo ike site na nsọtu nile nke uwa, ọ bu kwa n'akuku-ya nile ka M'kpọputara gi, we si gi, Orùm ka i bu, arọputawom i, ajughm i aju: atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi. Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù. I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha. N'ihi na Mu onwem, Jehova, Chineke-gi, nējidesi aka-nri-gi ike, bú Onye nāsi gi, Atula egwu, Mu onwem eyeworo gi aka. Atula egwu, gi idide, bú Jekob, unu ndikom Israel; Mu onwem eyeworo gi aka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ọzọ, Onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel. Le, emewom ka i ghọ ihe-nkpọre eji azọcha ọka, bú ihe di nkọ di ọhu nwere ezé: i gāzọcha ugwu, zọpia ha, i gēme kwa ugwu ntà ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka. I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n'Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi. Ndi ewedara n'ala na umu-ob͕eye nāchọ miri ma ọ dighi nke dinu, ire-ha kpọsiri nku n'ihi akpiri kpọrọ nku; Mu onwem, bú Jehova, gāza ha, Mu, bú Chineke Israel, M'gaghi-arapu ha. M'gākwaghe osimiri n'elu ugwu di iche iche ọhia nādighi, na isi-iyi n'etiti ndagwurugwu di iche iche: M'gēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, me kwa ka ala ọkpọ-nku ghọ ebe miri nāsuputa. M'gāku n'ọzara osisi cedar na osisi acacia na osisi myrtle na osisi manu; M'gāmakọta n'ala ihe nādighi osisi fir na osisi pine na osisi cypress: ka ha we hu, mara, tukwasi obi, nwe uche ighọta n'otù, na aka Jehova mere nka, na Onye Nsọ nke Israel kère ya. Wetanu okwu-ikpe-unu nso, ka Jehova nāsi; butenu ihe nile unu dabere nso, ka Eze Jekob nāsi. Ka ha bute ha nso, gosi ayi ihe ahu nke gēme: gosinu ihe nile emere na mb͕e mbu, ihe ha bu, ka ayi we tukwasi ha obi-ayi, we mara ikpe-azu-ha; ma-ọbu menu ka ayi nuru ihe ahu nile nke nābia. Gosinu ihe ahu nile gābia n'ọdi-n'iru, ka ayi we mara na chi ka unu bu: e, menu ezi ihe, ma-ọbu menu ihe ọjọ, ka ayi we lerita onwe-ayi anya gburugburu n'ujọ, hu ya n'otù. Le, unu onwe-unu sitere n'ihe nābughi ihe, ọlu-unu site-kwa-ra n'ihe-efu: ihe-árú ka onye nārọputa unu bu. Akpọtewom otù onye site n'Ugwu, o we bia, otù onye site n'ọwuwa-anyanwu nke gākpọku aham: ọ gābiakwasi kwa ndi nọchiri anya eze dika agāsi na ha bu urọ, na dika ọkpu-ite si azọ ájá. Ònye gosiworo ya site na mbu, ka ayi we mara? na site na mb͕e gara aga, ka ayi we si, Ọ bu onye ezi omume? e, ọ dighi onye nēgosi, e, ọ dighi onye nēme ka ayi nuru, e, ọ dighi onye nānu okwu-ọnu-unu. Abum onye mbu isi Zaion, Le, le ha: M'gēnye kwa Jerusalem onye nēzisa ozi ọma. M'we le, ma ọ dighi onye M'huru; n'etiti ndia kwa, ma ọ dighi onye-ndum-ọdu di, ka M'we jua ha ajuju, ha we zaghachim okwu. Le, ha nile bu ajọ ihe; ihe-efu ka ọlu nile ha bu: ifufe na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka arusi nile ha awuru awu bu.