Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 40:6-7 - Compare All Versions

AISAIA 40:6-7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa. Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke ONYENWE ANYị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ.

AISAIA 40:6-7 IGBOB (Bible Nso)

Ọ bu olu onye nāsi, Kpọ nkpu. Otù onye we si, Gini ka m'ganākpọ nkpu? Anu-aru nile bu ahihia, ima-nma-ya nile di kwa ka okoko ọhia: ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo; n'ihi na iku-ume Jehova ekukwasiwo ya: n'ezie ahihia ka ndi ahu bu.