AISAIA 40:28-31
AISAIA 40:28-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? ONYENWE ANYị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya. Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume. Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa, ma ndị niile olileanya ha dị na ONYENWE ANYị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
AISAIA 40:28-31 Bible Nso (IGBOB)
Ì maghi? ì nughi? Chineke nke mb͕e ebighi-ebi ka Jehova, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ dighi-ada #mbà, ike adighi-agwu kwa Ya; ọ dighi ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya. Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba. Ọbuná umu-ckoro nāda #mbà, ike nāgwu kwa ha, ọbuná umu-okorọbia nāsu ngọngọ da: ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.